Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 31 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 18 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Ọgọọst 2027

Tiuzdee · Izu nke 11 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Dormition

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 2:14–3:3

14Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya. 15Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi. 16Nʼetiti ndị ahụ na-ala nʼiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nʼetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Onye zuru ime ihe ndị a? 17Nʼihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahịa. Kama, nʼime Kraịst anyị na-ekwu okwu anyị site nʼobi dị ọcha, dịka ndị ahụ Chineke zipụrụ ịrụ ọrụ a. 3:1Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme? 2Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa. 3Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ.

Oziọma

Mat 23:23–28

23“E, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu ruo nʼakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nʼubi unu, dịka mint, diil na kumin, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na okwukwe ihe dị mkpa. Ihe ndị a ka unu kwesiri ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndị ọzọ anya. 24Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel. 25“Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nʼike na ọchịchọ ọjọọ niile. 26Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha. 27“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha. 28Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 31 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike