Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 31 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Ọgọọst 2027

Tiuzdee · Izu nke 22 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 22 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Te 5:1–6, 9–11

1Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ. 2Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị. 3Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ. 4Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi. 5Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị. 6Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị. 9Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 10Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ. 11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 27:1, 4, 13–14

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 4:31–37

31O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe. 32Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike. 33Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu, 34“Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!” 35Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ. 36Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!” 37Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike