Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 17 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 4 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Jun 2027

Tọọzdee · Izu nke 7 nke Ista · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

St. Metrophanes the first Patriarch of Constantinople († c. 326)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 25:13–19

13Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs. 14Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a. 15Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe. 16“Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo. 17Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ. 18Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere. 19Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ.

Oziọma

Jọn 16:23–33

23Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu. 24Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke. 25“Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m na-agaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu niile ihe banyere Nna m nʼụzọ unu ga-aghọta ya. 26Nʼụbọchị ahụ, unu ga-arịọ ihe nʼaha m. Asịghị m unu na m ga-arịọ Nna ihe nʼihi unu. 27Nʼihi na Nna m nʼonwe ya hụrụ unu nʼanya, nʼihi na unu hụrụ m nʼanya kwerekwa na m si nʼebe Chineke nọ bịa. 28Esi m nʼebe Nna nọ pụta, bịa nʼime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna.” 29Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee, ugbu a ka okwu gị doro anya. Ọ bụkwaghị ilu ka i na-atụ. 30Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe Chineke nọ bịa.” 31Jisọs zara ha, “Unu ekwerela ugbu a? 32Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na Nna m nọ. 33“Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Jun na kalenda nzukọ bụ 17 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike