Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 4 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 22 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Febrụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 36 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Apostle Timothy of the Seventy († 96)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Jem 1:19–27

19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. 20Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. 21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu. 22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. 23Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo. 24O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. 25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme. 26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. 27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.

Oziọma

Mak 10:17–27

17Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 18Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke. 19Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’ ” 20Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.” 21Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.” 22Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba. 23Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.” 24Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke. 25Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 26Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 27Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 4 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike