Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 16 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 3 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Jenụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 33 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee tupu Teofani
Oge Krismas (Svyatki)
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka Satọdee tupu Teofani)
14Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a. 15Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ. 16Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe. 4:1Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ. 2Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha. 3Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha. 4Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya, 5nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.
Oziọma (maka Satọdee tupu Teofani)
1Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ, 2“Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” 3Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 5Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya. 6Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 7Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. 9Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 10Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ. 11“Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 16 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike