Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 15 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 2 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Disemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 29 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Habakuk (7th C BC)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya. 2Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya. 3Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa. 4Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.” 5Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.” 6Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi. 7O wepụtara ụbọchị ọzọ nke ọ kpọrọ Taa, o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu ahụ e kwurula ihe banyere nʼoge gara aga sị, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike.” 8Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ. 9Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke. 10Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya. 11Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha. 12Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ. 13Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.
Oziọma
45Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. 46Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’ ” 47Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 48Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Disemba na kalenda nzukọ bụ 15 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike