Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 15 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Disemba 2026

Tiuzdee · Izu nke 3 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 3 nke Advent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Zef 3:1–2, 9–13

1Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya. 2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso. 9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe. 10Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche. 11Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m. 12Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị. 13Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 34:1–2, 5–6, 16–18, 22

1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. 5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. 6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. 16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. 17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. 18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. 22Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

Oziọma

Mat 21:28–32

28“Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’ 29“Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ. 30“Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị. 31“Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke. 32Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike