Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 14 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 1 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Disemba 2026
Mọnde · Izu nke 29 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Naum (7th C BC)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
5Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu. 6Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi. 7Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa, 8unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara, 9ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a. 10Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’ 11Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” 17Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara? 18Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi? 19Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.
Oziọma
37Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ, 38na-asị, “Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.” 39Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!” 40Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.” 41Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya, 42sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị. 43Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị. 44Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Disemba na kalenda nzukọ bụ 14 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike