Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 11 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 28 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Disemba 2026
Fraịdee · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr and Confessor Stephen the New of the Mount of St Auxentius († 767)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
15Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ. 16Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla. 2:1Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe. 2Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi. 3Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma. 4Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya. 5Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke. 6Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha. 7Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi. 8Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị. 9Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe niile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu, 10ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.
Oziọma
12Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. 13Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ 14“Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ 15“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. 16“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ 17“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ 18“Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ 19“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ 20“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. 21Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ 22“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? 23Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ 24“Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ 25“Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ 26“Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. 27Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ” 28Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Novemba na kalenda nzukọ bụ 11 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike