Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 10 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 27 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Disemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Icons of the Mother of God: “Znamenie” of Novgorod and “Znamenie”, the Kursk-Root

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Taị 1:5–2:1

5Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu. 6Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike. 7Ebe ọ bụ na onye nlekọta nʼahụ ihe banyere chọọchị Chineke, ọ ga-abụ onye na-enweghị ihe ịta ụta. Ọ gaghị abụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-alụ ọgụ mgbe niile, onye hụrụ ego nʼanya. 8Ọ ga-abụ onye na-anabata ndị ọbịa, na onye na-ahụ ezi ihe nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-akwanyere onwe ya ugwu, ezi mmadụ ụzọ ya kwụ ọtọ, onye dị nsọ, na onyeisi zuruoke. 9Ọ ga-abụkwa onye jidesiri oziọma ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi aka ike dịka eziri ya. Nke ga-eme ka o nwe ike gbaa ndị ọzọ ume site na ozizi ahụ nke zuruoke, nakwa ịtụ ndị ahụ na-eguzogide ya mmehie ha nʼihu. 10Nʼihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị, ndị na-ekwu okwu efu, na ndị aghụghọ, nke ka nke, ndị si nʼotu ndị obibi ugwu pụta. 11Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa. 12Ọ bụ otu onye nʼime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit niile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nʼazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.” 13Nʼezie, okwu a bụ eziokwu. Nʼihi nke a, baara ha mba nʼolu ike banyere mmehie ha ka ha nwee ike zuo oke nʼokwukwe, 14ka ha kwụsị ige ntị nʼakụkọ ifo ndị Juu na-akọ, maọbụ iwu nke ndị jụrụ ịnabata eziokwu nyere. 15Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ. 16Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla. 2:1Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.

Oziọma

Luk 18:31–34

31Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu. 32A ga-arara ya nyefee ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, mee ya ihe ihere, bụkwaa ya ọnụ mmiri asụ. 33Ha ga-apịa ya ihe, gbukwaa ya; ma nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie ọzọ.” 34Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Novemba na kalenda nzukọ bụ 10 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike