Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 12 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 29 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Disemba 2026

Satọdee · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Paramon and 370 Martyrs in Bithynia († 250)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Efe 1:16–23

16esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile. 17Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ, 18ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ. 19Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị. 20Nke ọ rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka ọ nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe. 21Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa. 22O mere ka ihe niile dị nʼokpuru ya, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe niile nye nzukọ ya bụ chọọchị. 23Nke bụ ahụ ya, ozuzu oke nke onye ahụ na-emejupụta ihe niile nʼụzọ niile.

Oziọma

Luk 10:19–21

19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Novemba na kalenda nzukọ bụ 12 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike