Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 4 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 21 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Disemba 2026
Fraịdee · Izu nke 27 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Entry into the Temple of our Most Holy Lady Theotokos and Ever-Virgin Mary
Obubu ọnụ Ọmụmụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ. 3Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya. 4Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ. 5Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ. 9“Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ. 10Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ. 16Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime. 34Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya. 35Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Mgbe ahụ, eze Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel, na ndịisi ebo niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile, ka ha bịakwute eze na Jerusalem, maka i site na Zayọn bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 3Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ. 4Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja na ndị Livayị buliri ha elu. 5Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba. 6Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ. 7Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, zochie igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okporo osisi ndị e ji ebu ya. 9O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta. 10Mgbe ndị nchụaja si nʼEbe Nsọ ahụ pụta, igwe ojii jupụtara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. 11Ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
27Ụbọchị nke asatọ, na nʼụbọchị ọbụla so ya, ndị nchụaja ga-achụ aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja, chụọkwa aja udo. Mgbe ahụ, aga m anabatakwa unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.” 44:1Mgbe ahụ, o mere ka m laghachi nʼụzọ, nʼọnụ ụzọ ama nke ebe nsọ ahụ, nke dị nʼezi, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, ma a gbachiri ya agbachi. 2Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi. 3Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.” 4Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
Akwụkwọ ozi (maka Mbata Nne Chineke nʼụlọnsọ)
1Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo. 2E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ. 3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ, 4nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ. 5Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a. 6Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ. 7Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.
Oziọma (maka Mbata Nne Chineke nʼụlọnsọ)
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Novemba na kalenda nzukọ bụ 4 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike