Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 25 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Novemba 2026
Wenezdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Katrin nke Aleksandria, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha. 2Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha. 3Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ. “Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị, Eze nke mba niile. 4Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 7Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 8Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ; 9ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
Oziọma
12“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. 13Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. 14Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. 15Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. 16Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. 17Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 18Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. 19Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Katrin nke Aleksandria, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike