Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 24 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Novemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: uhie
Onye nsọ Andru Dung-Lac, Onye ụkọchukwu, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya. 15Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.” 16Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi. 17Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ. 18Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.” 19Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha. 20A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.
Abụ Ọma nzaghachi
10Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “ Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe. 11Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ. 13Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.
Oziọma
5Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị, 6“Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.” 7Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?” 8Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha. 9Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.” 10Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze. 11A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Andru Dung-Lac, Onye ụkọchukwu, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike