Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 26 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Novemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mkp 18:1–2, 21–23; 19:1–3, 9

1Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa. 2O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ. 21Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ. 22Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ. 23Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa. 19:1Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị. 2Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.” 3Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” 9Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 100:1–5

1Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. 2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya. 5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.

Oziọma

Luk 21:20–28

20“Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola. 21Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya. 22Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru. 23Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ. 24Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru. 25“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. 26Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. 27Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. 28Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike