Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 5 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 23 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Novemba 2026
Tọọzdee · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Holy Apostle James, the Brother of the Lord († ca.63)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
9Nʼezie ụmụnna m, amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ hụjuokwa anya nʼetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nʼihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọbụla mgbe anyị na-ezisara unu oziọma Chineke. 10Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe dị ka Chineke si bụrụ onye akaebe, na mmekọrịta anyị na unu bụ ndị kwere ekwe, bụ nwekọrịta dị ọcha na nke ezi omume, na nke ịta ụta ọbụla na-adịghị na ya. 11Nʼihi na anyị mesoro onye ọbụla nʼime unu dị ka nna si emeso ụmụ nke ya, 12na-agba unu ume, na-akasị unu obi, na-akwagidekwa unu na unu kwesiri ibi ndụ kwesiri ụmụ Chineke, onye kpọbatara unu nʼime alaeze ya na ebube ya. 13Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya. 14Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Jemis)
11Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. 12Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. 13Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. 14Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. 15Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, 16ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. 17Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs. 18Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. 19Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
Oziọma
49Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.” 50Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.” 51Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem. 52O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa; 53ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem. 54Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?” 55Ọ tụgharịrị bara ha mba. 56Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ.
Oziọma (maka Onye nsọ Jemis)
54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile? 55Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom? 56Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?” 57Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.” 58Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 5 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike