Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 13 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 30 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Ọktoba 2026
Tiuzdee · Izu nke 20 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Gregory, Bishop and Enlightener of Great Armenia († c. 335)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
16Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu. 17Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ 18otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ. 19Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ. 20Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu. 21Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst. 22Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma. 23Enwere m olileanya nʼezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nʼebe a ga-abụ.
Akwụkwọ ozi (maka Wenezdee)
24Nʼezie, enwere m olileanya na site nʼinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya. 25Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m. 26Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga. 27Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute. 28Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe. 29Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya. 30Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ.
Oziọma
12Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 13Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya. 14O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” 15Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa. 16Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.
Oziọma (maka Wenezdee)
33Ha sịrị, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere oge niile, ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri, na-aṅụkwa.” 34Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ oriri nʼọlụlụ di na nwunye, ha ga-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ? 35Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.” 36Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba. 37Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi. 38Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ. 39O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nʼihi na ọ ga-asị, ‘Nke ochie ahụ ka mma.’ ”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Septemba na kalenda nzukọ bụ 13 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike