Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 13 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Ọktoba 2026

Tiuzdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Gal 5:1–6

1Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ. 2Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla. 3Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ. 4E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya. 5Nʼihi na anyị onwe anyị nwere olileanya na site nʼike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe anyị. 6Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 119:41, 43–45, 47–48

41O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; 43Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. 44Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. 45Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 47nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. 48Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.

Oziọma

Luk 11:37–41

37Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri. 38O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido. 39Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche. 40Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya? 41Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike