Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 12 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 29 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Ọktoba 2026
Mọnde · Izu nke 20 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Kyriakos the Hermit of Palestine († 556)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
12Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji. 13Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ. 14Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu. 15Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa! 16Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Sirịakọs Onye bi naanị ya)
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Oziọma
37Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu. 38Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka. 39O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa. 40Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha. 41Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst. 42Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha. 43Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.” 44Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Septemba na kalenda nzukọ bụ 12 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike