Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Sọl na Devid

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Sọl na Devid

Ọnwụ Sọl

1Sa 31:1–13 · 1Ih 10:1–14

1 Samuel

1Sa 31:1–13

1Nʼoge a, ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.

2Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.

3Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.

4Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.

5Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ.

6Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ.

7Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.

8Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.

9Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile.

10Ha tinyere ihe agha Sọl nʼụlọ Ashtọret, kpọgidekwa ozu ya nʼaja ụlọ mgbidi obodo Bet-Shan.

11Mgbe ndị obodo Jebesh Gilead nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,

12ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo Bet-Shan. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo Bet-Shan tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa Jebesh ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ.

13Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi Tamarisk dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.

1 Ihe E Mere

1Ih 10:1–14

1Nʼoge a ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.

2Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.

3Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ.

4Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.

5Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, nwụọkwa.

6Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ nwụrụ, ndị niile si nʼụlọ ya nwụkwara nʼotu mgbe ahụ.

7Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.

8Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.

9Ha yipụrụ ya ihe niile oyi, buru isi ya na ihe agha ya, zipụkwa ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nye ndị ha niile na arụsị ha niile.

10Ha tinyere ihe agha ya nʼụlọ chi ha, kwụbakwa okpokoro isi ya nʼụlọ Dagọn.

11Mgbe ndị Jebesh Gilead niile nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,

12ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, biliri gaa buru ozu Sọl na ụmụ ya, bulata ha na Jebesh. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi ukwu dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.

13Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị, o debeghị okwu Onyenwe anyị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase,

14ma ọ jụghị ase site nʼọnụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere Onyenwe anyị ji gbuo ya, were alaeze ya nyefee Devid nwa Jesi nʼaka.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY