Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Solomọn

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Solomọn

Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya ọzọ

1Ez 9:1–9 · 2Ih 7:11–22

1 Ndị Eze

1Ez 9:1–9

1Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime,

2Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn.

3Onyenwe anyị sịrị ya, “Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.

4“Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile,

5mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’

6“Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha,

7mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.

8Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’

9Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”

2 Ihe E Mere

2Ih 7:11–22

11Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, mezukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nakwa nʼụlọeze nke ya onwe ya.

12Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja.

13“Mgbe ọbụla m mere ka mmiri ghara izo, maọbụ zidata igurube ka ha bịa bibie ihe ubi unu, maọbụ zidata ọrịa nʼetiti unu,

14ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.

15Anya m ga-eghere oghe mgbe niile; otu a kwa, ntị m ga-egherekwa oghe ịhụ na ịnụ ekpere niile a na-ekpe nʼụlọnsọ a.

16Edoola m ụlọnsọ a nsọ nye onwe m, ka Aha m dị nʼebe ahụ ruo ebighị ebi; anya m abụọ na obi m ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.

17“Ma gị onwe gị, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile.

18Aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị guzosie ike, dịka mụ na nna gị Devid gbara na ndụ, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze nke ga-achị Izrel.’

19“Ma ọ bụrụ unu alaghachi azụ, gbakụta ụkpụrụ na iwu niile, bụ nke m nyere unu azụ, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe, na ịkpọ isiala nye ha,

20mgbe ahụ, aga m esite nʼala m, bụ nke m nyere ha, hopu Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m, meekwa ka ọ ghọọ ihe e ji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.

21Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya, ha ga-asị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’

22Ndị mmadụ ga-aza, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY