Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Sọl na Devid

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Sọl na Devid

Abụ Devid banyere nnapụta

2Sa 22:1–51 · Abụ 18:1–50

2 Samuel

2Sa 22:1–51

1Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.

2Ọ sịrị: “ Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.

3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.

4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.

5Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.

6Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m.

7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, akpọkuru m Chineke m. Akwa m ruru ya ntị. O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.

8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.

9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.

10O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.

11Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.

12O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.

13Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.

14Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.

15Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.

16E kpughere ala ala nke oke osimiri. Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba nke Onyenwe anyị, na nkuume si nʼimi ya pụta.

17“O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.

18Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.

19Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.

20Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.

21“ Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.

22Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị; ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.

23Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.

24Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.

25Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya.

26“Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.

27Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.

28Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.

29Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m, Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.

30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.

32Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?

33Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

34Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.

35Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.

36Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.

37Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.

38“Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha. Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.

39Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ.

40Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha. I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.

41I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile.

42Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.

43Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.

44“Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ. Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba. Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.

45Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.

46Obi na-ada ha mba. Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.

47“ Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.

48Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.

49Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.

50Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto.

51“Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu. Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere. Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”

Abụ Ọma

Abụ 18:1–50

1Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.

2Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.

3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.

4Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.

5Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m.

6Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.

7Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.

8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.

9O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.

10Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.

11O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.

12Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.

13Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.

14Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.

15E kpughere ala ala nke oke osimiri, gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị, na nkuume si gị nʼimi pụta.

16O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.

17Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.

18Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.

19Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.

20Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.

21Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.

22Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.

23Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.

24Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.

25Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.

26Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.

27Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.

28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.

29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.

31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?

32Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

33Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.

34Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.

35Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.

36Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.

37Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha; alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.

38Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.

39Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.

40I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.

41Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.

42Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.

43Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.

44Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.

45Obi na-ada ha mba; ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.

46Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.

47Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,

48onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro, napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.

49Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, aga m abụku aha gị abụ otuto.

50Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY