22“Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.
23Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.
Nyochaa › Oziọma nʼakụkụ ibe ha › Ozizi
Oziọma nʼakụkụ ibe ha · Ozizi
Mat 6:22–23 · Luk 11:34–36
22“Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.
23Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.
34Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị.
35Ya mere, lezie anya ka ị mara ka ìhè dị nʼime gị, ọ bụghị ọchịchịrị.
36Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.”
Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY