Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 31 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 18 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Disemba 2027
Fraịdee · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Sebastian at Rome with his companions: Martyrs Nicostratus, his wife Zoe, Castorius, Tranquillinus the Presbyter and his sons the Deacons Marcellinus and Mark, Claudius, his son Symphorian and brother Victorinus, Tiburtius and Castulus († c. 287)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
15Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ. 16Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla. 2:1Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe. 2Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi. 3Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma. 4Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya. 5Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke. 6Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha. 7Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi. 8Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị. 9Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe niile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu, 10ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.
Oziọma
33Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?” 34Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya. 35Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.” 36Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha, 37“Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.” 38Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.” 39Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. 40Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị. 41Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Disemba na kalenda nzukọ bụ 31 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike