Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 24 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 11 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Disemba 2027
Fraịdee · Izu nke 27 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Daniel the “Stylite” [Pillar-Dweller] of Constantinople († 489-490)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị, 2Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị. 8Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ. 9Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a. 10Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ. 11Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi. 12Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ. 13Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs. 14Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe. 15Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa. 16Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ. 17Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m. 18Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.
Oziọma
37Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị. 38Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya. 22:1Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso. 2Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ. 3Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya. 4Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha. 5Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego. 6O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ. 7O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja. 8O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Disemba na kalenda nzukọ bụ 24 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike