Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 25 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 12 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Disemba 2027

Satọdee · Izu nke 27 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Saint Spyridon the Wonderworker, Bishop of Tremithus († c. 348)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Gal 5:22–6:2

22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.

Oziọma

Luk 13:18–29

18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.” 22O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. 23Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, 24“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. 25Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ 26“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ 27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ 28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. 29Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Disemba na kalenda nzukọ bụ 25 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike