Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 23 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Disemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 4 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
23 Disemba
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Onye nsọ Jọn nke Kanty, Onye ụkọchukwu · Ncheta nkenke
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Lee, aga m ezipu onyeozi m, onye ga-edozi ụzọ nʼihu m. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ahụ unu na-ele anya ya ga-abịa na mberede nʼụlọnsọ ukwu ya. Onyeozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-agụsị unu agụụ ike, ga-abịa,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 2“Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa. 3Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye nʼezi omume. 4Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye Onyenwe anyị ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga. 4:5“Lee, aga m ezitere unu Ịlaịja onye amụma, tupu ụbọchị ukwu ahụ dị oke egwu bụ ụbọchị Onyenwe anyị abịa. 6Ọ ga-eme ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, meekwa ka obi ndị bụ ụmụ chigharịkwutekwa nna ha; ka m ghara ịbịa ma jiri ịbụ ọnụ laa ala ahụ nʼiyi.”
Abụ Ọma nzaghachi
4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya. 10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya. 14Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
Oziọma
57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. 59Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, 60ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” 61Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.” 62Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ. 63Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya. 64Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke. 65Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa. 66Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn nke Kanty, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike