Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 13 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 31 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Novemba 2027

Satọdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Apostles of the 70: Stachias, Amplias, Urban, Narcissos, Apellias and Aristoboulos (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 3:12–18

12Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla. 13Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe. 14Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ. 15Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha. 16Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ. 17Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya. 18Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.

Oziọma

Luk 8:16–21

16“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. 17Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè. 18Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.” 19Nʼoge a, nne ya na ụmụnne ya nwoke bịakwutere ya. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ. 20Otu onye gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo nʼezi, ha chọrọ ịhụ gị.” 21Ọ zara sị, “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 31 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 13 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike