Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 13 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Disemba 2026
Sọnde · Izu nke 3 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 3 nke Advent
Sọnde · Agba ofufe: pinki
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ. 2O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ, na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị. O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi, 10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma. 11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile.
Abụ Ọma nzaghachi
47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. 54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
16Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile. 17Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. 18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. 19Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ. 20Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya. 21Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. 22Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile. 23Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 24Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
Oziọma
6Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. 7Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere. 8Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ. 19Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ? 20O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.” 21Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.” 22Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?” 23Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’ ” 24Ma ndị Farisii ahụ ezitere 25jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?” 26Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị. 27Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.” 28Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Lusi, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike