Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 6 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Disemba 2026

Sọnde · Izu nke 2 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 2 nke Advent

Sọnde · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 40:1–5, 9–11

1Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi, ka Chineke gị kwuru. 2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile. 3Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị. 4A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị. 5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.” 9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.” 10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 85:8–13

8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

2Pt 3:8–14

8Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. 9Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị. 10Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya. 11Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, 12dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. 13Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị. 14Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo.

Oziọma

Mak 1:1–8

1Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke. 2Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.” 3“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 5Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 6Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 7O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. 8Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike