Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 1 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Disemba 2026

Tiuzdee · Izu nke 1 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 1 nke Advent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 11:1–10

1Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ. 2Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị. 3Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya. 4Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ. 5Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya. 6Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha. 7Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi. 8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi. 9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 72:1–2, 7–8, 12–13, 17

1Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa. 8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa 12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka. 13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ. 17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.

Oziọma

Luk 10:21–24

21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya. 22“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara ahụ bụ, karịa Nna ahụ. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara na ndị ahụ Ọkpara chọrọ igosi onye Nna ya bụ.” 23Mgbe ahụ ọ tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzị na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ ugbu a. 24Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike