IGCB · Isi 25 / 48
Izikiel 25
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha.
3Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu,
4nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị.
5Aga m eme ka obodo Raba ghọọ ebe ịta nri nye ịnyịnya kamel, meekwa ka ala Amọn ghọọ ebe igwe ewu na atụrụ na-amakpu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
6Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Nʼihi na ị kụrụ aka gị, zọọ ụkwụ gị nʼala gidim, ma sitekwa nʼịkpọ asị nke obi gị ṅụrịa ọṅụ megide ala Izrel,
7nʼihi ya, lee, aga m esetipụ aka m megide gị, were gị nyefee nʼaka ọtụtụ mba, ndị ga-alụta gị nʼagha. Aga m eme ka ị gwụsịa, mee ka ị hapụ ịdịkwa ọzọ. Aga m ala gị nʼiyi. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
8“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Moab na Sia sịrị, “Lee, Juda adịrịla ka mba ndị ọzọ niile,”
9nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ.
10Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile.
11Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
12“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara,
13nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo.
14Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
15“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi.
16Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri.
17Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’ ”
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org