Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 21 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 8 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Disemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 27 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Patapios of Thebes (7th C)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
11Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ. 12Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. 13Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu. 14Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị. 15Ụfọdụ ndị mmadụ adahielarị ụzọ, soro ekwensu. 16Ya mere, nwanyị ọbụla kwere ekwe, nke nwere nʼezinaụlọ ya ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, ya jisie ike gboro ha mkpa. Ọ dịghị mma ibogbu chọọchị nʼibu, ka o nwee ike iletazu ndị nọ nʼọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼezie. 17Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe. 18Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,” hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.” 19Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya. 20Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha. 21Ana m adọ unu aka na ntị nʼihu Chineke na nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼihu ndị mmụọ ozi a họpụtara, ka unu debe ụkpụrụ ndị a niile, nye onye ọbụla ntaramahụhụ nke ruru ya, elekwala onye ọbụla anya nʼihu.
Oziọma
12“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. 13Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. 14Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. 15Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. 16Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. 17Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 18Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. 19Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Disemba na kalenda nzukọ bụ 21 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike