Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 7 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Disemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 2 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 2 nke Advent
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Ambrọs, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi, ka Chineke gị kwuru. 2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile. 3Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị. 4A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị. 5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.” 6Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa. 7Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ. 8E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.” 9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.” 10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
Abụ Ọma nzaghachi
1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile. 2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ. 3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. 10Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “ Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe. 11Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ. 13Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.
Oziọma
12“Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu? 13Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Nʼezie, agwa m unu, ọ ga-aṅụrị oke ọnụ nʼihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ itoolu na itoolu ndị ọzọ ahụ na-agahieghị ụzọ. 14Ya mere, ọ bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Ambrọs, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike