Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 7 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 24 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Disemba 2026

Mọnde · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Entry of the Theotokos

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Tm 2:20–26

20Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla. 21Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ. 22Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta. 23Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu. 24O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya. 25Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu. 26Mgbe ahụ, ha nwere ike gbanahụ ọnya ekwensu, ka o jidechara ha ka ha mee uche ya.

Oziọma

Luk 17:20–25

20Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya. 21Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu. ” 22Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya. 23Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha. 24Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ. 25Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Novemba na kalenda nzukọ bụ 7 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike