Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 30 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 17 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Novemba 2026

Mọnde · Izu nke 27 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Saint Gregory the Wonderworker, Bishop of Neo-Cæsarea († c. 266-270)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Tm 5:1–10

1Abarala okenye mba nʼolu dị ike, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorobịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nʼanya okwu. 2Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke. 3Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu. 4Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ. 5Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị. 6Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ. 7Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta. 8Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ. 9Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di. 10Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Gregori Onye ọrụ ebube)

1Kọ 12:7–11

7Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. 8Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ. 9Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. 10Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. 11Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.

Oziọma

Luk 14:12–15

12Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ. 13Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ọlụsị na ndị ngwụrọ na ndị ìsì. 14A ga-agọzikwa gị, nʼihi na ha enweghị ike ịkwụghachi gị, a ga-akwụghachikwa gị mgbe ndị ezi omume ga-ebili nʼọnwụ.” 15Mgbe otu nʼime ndị a kpọrọ oriri nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Ngọzị ga-adịrị onye ga-eso rie oriri nʼalaeze Chineke.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Novemba na kalenda nzukọ bụ 30 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike