Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 23 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 10 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Novemba 2026

Mọnde · Izu nke 26 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Apostles of the 70: Herastos, Olympos, Rodion, Sosipater, Quartus and Tercias (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Tm 1:1–7

1Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs site nʼiwu Chineke Onye nzọpụta anyị, na nke Kraịst Jisọs, onye bụ olileanya anyị, 2Na-edegara gị bụ Timoti ezi nwa m nʼime okwukwe akwụkwọ a. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị. 3Dị ka m gbara gị ume, mgbe m na-aga Masidonia, nọgide nʼEfesọs ka i nwee ike nye mmadụ ụfọdụ iwu ka ha ghara ịga nʼihu nʼizi ụkpụrụ dị iche. 4Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nʼihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nʼokwukwe. 5Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị. 6Ụfọdụ e sikwala nʼihe ndị a dapụ, jehie ụzọ, site nʼoke ịrụ ụka na-abaghị uru. 7Ha chọrọ ịbụ ndị ozizi iwu ma ha amaghị ihe ha na-ekwu maọbụ ihe ha na-akwadosi ike.

Oziọma

Luk 12:13–15, 22–31

13Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.” 14Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?” 15Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.” 22Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi. 23Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe. 24Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a. 25Onye nʼime unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya? 26Ebe unu na-apụghị ime ihe nta dị otu a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ? 27“Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a. 28Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta. 29Ya mere, unu adọgbula onwe unu maka ihe unu ga-eri maọbụ ihe unu ga-aṅụ. Unu echegbukwala onwe unu. 30Nʼihi na ọ bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa. 31Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Novemba na kalenda nzukọ bụ 23 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike