Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Solomọn

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Solomọn

Solomọn na Hiram kwadoro maka iwu ụlọ

1Ez 5:1–12 · 2Ih 2:1–16

1 Ndị Eze

1Ez 5:1–12

1Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma.

2Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya:

3“Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ. Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo.

4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla.

5Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’

6“Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”

7Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.”

8Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị, “Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa.

9Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”

10Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ.

11Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ.

12Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.

2 Ihe E Mere

2Ih 2:1–16

1Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha Onyenwe anyị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze.

2O manyere ndị ọrụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa (70,000) na-ebu ibu, na ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ (80,000), na ndị o doro dịka ndịisi ha, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị isii (3,600).

3Solomọn zigara Hiram eze Taịa ozi sị ya, “Zidatara m osisi sida dịka i mere nʼoge nna m Devid wuru ụlọeze nke ya.

4Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke Onyenwe anyị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi.

5“Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile.

6Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya?

7“Zitere m, onye ǹka, onye maara otu e si eji ọlaedo na ọlaọcha, na bronz, na igwe arụ ọrụ. Onye bụkwa onye maara ọrụ ǹka metụtara akwa dị iche iche, akwa ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie, na nke anụnụ anụnụ. Ọ ga-abụkwa onye igbunye akara nʼihe doro anya, onye ga-arụ ọrụ na Juda na nʼime Jerusalem, ebe ọ ga-eso ndị ǹka m, bụ ndị nna m Devid họpụtara rụọ ọrụ.

8“Zitekwara m osisi sida, na osisi junipa, na osisi algụm, ndị sitere nʼọhịa Lebanọn, nʼihi na ndị gị bụ ọkachamara nʼọrụ ịwa osisi. Aga m ezitekwa ndị m ga-abịa soro ha rụọ ọrụ,

9ime ka osisi ha ga-egbutere m dị ukwuu, nʼihi na ya bụ ụlọnsọ ga-ebu ibu, maakwa mma.

10Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.”

11Hiram, eze Taịa zighachiiri Solomọn akwụkwọ ozi sị ya. “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị hụrụ ndị ya nʼanya ka o ji mee gị eze ha.”

12Hiram kwukwara sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye kere eluigwe na ụwa. Onye nyere Devid, bụ eze, nwa nwere nghọta na akọnuche dị otu a, iwuru Onyenwe anyị ebe obibi, na iwukwa ụlọeze nke aka ya.

13“Ana m ezitere gị Huram-Abi, onye ọka maara ọrụ ya nke ọma.

14Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị.

15“Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa.

16Anyị ga-egbutu osisi niile ị chọrọ site nʼugwu Lebanọn, sitekwa nʼosimiri budata ha obodo Jopa, ebe i nwere ike isite buruo ha Jerusalem.”

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY