Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Ndị eze Juda
Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Ndị eze Juda
Ọnwụ Asa
1Ez 15:23–24 · 2Ih 16:11–14
1Ez 15:23–2423Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi.
24Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2Ih 16:11–1411Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel.
12Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru.
13Asa nwụrụ nʼiri afọ anọ na otu nke ọchịchị eze ya, sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
14Ha liri ya nʼili nke ọ waara onwe ya nʼobodo Devid. Ha dobere ya nʼelu ihe ịdọba ozu nke jupụtara na ụda dị iche iche, na mmanụ na-esi isi ụtọ nke a gwọkọtara nke ọma, surekwara ya ihe nsure ọkụ nʼebe ọ dị ukwuu iji kwanyere ya ugwu.
Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY