Ọba akwụkwọ ihe ọmụma › Ụzọ na njem
Ụzọ na njem
Ụzọ na okporoụzọ
Hibru derek, mesillah · Okporoụzọ Eze · Ụzọ Osimiri
Ọtụtụ ụzọ nʼala Baịbụl abụghị nke e wuru ewu, kama nke ụkwụ zọrọ: ụzọ ụkwụ mmadụ na ụkwụ anụ zọkọrọ, nke e wepụrụ nnukwu nkume nʼelu ya, nke a na-anaghịkwa agafe nʼoge mmiri ozuzo. Nnukwu ụzọ gafere ala ahụ nʼetiti Ijipt na Mesopotemia. Nʼụsọ oke osimiri na site nʼụzọ ugwu Megido ka ụzọ ahụ Aịzaya nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu maka ya mgbe o kwuru “nʼakụkụ osimiri” (Aịzaya 9:1) gara — Ụzọ Osimiri. Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, gafee Edọm, Moab na Gilead, ka Okporoụzọ Eze dị. Mosis rịọrọ eze Edọm ka o kwe ka ha gafee ala ya — “Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe” (Ọnụọgụgụ 20:17) — ma ọ jụrụ.
Ndị njem na-achọta ụzọ ha site nʼakara ala na mkpokọta nkume: “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama” (Jeremaya 31:21). Nʼoge nsogbu, ndị ahịa kwụsịrị ije, “ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga” (Ndị Ikpe 5:6). Ndị eze Peshịa na-ezipụ “ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu” nʼofe alaeze ha (Esta 8:10), Herodotus kọwakwara okporoụzọ eze ha na ebe nkwụsị ya. Aịzaya na-eji ihe oyiyi ụzọ e welitere elu ma mee ka ọ dị larịị: “meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị” (Aịzaya 40:3).
Amaokwu ndị dị mkpa
Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a.“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze.Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.Amaokwu niile kpọrọ ya aha (83)
Ebe okwu Hibru, Aramaic ma ọ bụ Grik maka ya dị n'ime ederede.
Ọnụọgụgụ2
Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.Ndị Ikpe4
Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ.Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.”1 Samuel1
Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh.2 Samuel4
“Ekwutela ya na Gat. Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn. Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri.Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.1 Ndị Eze1
Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo.2 Ndị Eze1
Eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, onyeisi ndị na-eje ozi na ọchịagha ya na usuu ndị agha ka ha jekwuru Hezekaya na Jerusalem. Ndị agha a bịaruru Jerusalem kwụsị nʼakụkụ olulu warawara e gwuru ebe Ọdọ mmiri dị elu si nʼasọfe, nʼụzọ e si aga obosara ala ndị na-asụ akwa.1 Ihe E Mere2
Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.2 Ihe E Mere1
Eze ji osisi algụm ndị ahụ mee nkwasa nrigo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. O nwebeghị oge ọzọ e nwere ụdị ngwa egwu e ji osisi ọma dị otu a kwaa nʼala Juda niile.Abụ Ọma2
Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.Ilu2
ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.Ekiliziastis2
mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ, mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala, mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ, ma abụ ha niile na-ala ala,mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.Abụ nke Abụ1
Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.Aịzaya15
Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa.Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ, dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga, mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala.Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa. Ọṅụ adịghịkwa, otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume agaghị ejegharị nʼelu ya.Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa.Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba. Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile, dịka mgbada ọnya mara. Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị na ịba mba nke Chineke gị.Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile. Dozienụ ụzọ maka ndị m. Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile. Bupụsịanụ nkume niile, weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile.Jeremaya14
“Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem, legharịa anya, ma mara, chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile. Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye, bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu. M ga-agbagharakwa obodo aỌ bụ na unu adịghị ahụ ihe na-eme nʼobodo niile nke Juda, na ihe ha na-eme nʼokporoụzọ niile nke Jerusalem?Mgbe ahụ, aga m eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye nʼobodo niile nke Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem kwụsị. Ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu.Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru.Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a.“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwaNʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa.Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem?Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị.“ Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile.Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.Abụ Akwa6
Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.Izikiel4
“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.Ọ ga-eji ụkwụ ịnyịnya ya niile zọtọọ okporoụzọ gị niile, jirikwa mma agha gbuchapụ ndị gị niile. Ogidi niile nke ike gị ga-adaru ala.Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya, meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile. Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya, site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.Juel1
Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ. Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị. Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha, ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.Emọs1
Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị, “Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile; ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa. A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa, kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.Maika1
Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.Nehum2
Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ dịka ohu a dọtara nʼagha. A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume, nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile. E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ, e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.Zefanaya1
“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.Zekaraya2
Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.Matiu3
“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke.Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi.Luk3
Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị,“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’“Ohu ahụ lọtara, kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ oriri kwuru. Mgbe ahụ, iwe dị ukwuu were nna ya ukwu, nke a mere ka o zipụ ohu ya sị ya, ‘Gaa ngwangwa nʼokporoụzọ ukwu na nʼokporoụzọ nta dị nʼobodo a, kpọbata ndị ogbenye, na ndị ụkwụ rụrụ, na ndị ìsì na ndị ngwụrọ.’Ọrụ Ndị Ozi3
Nʼihi nke a, ndị mmadụ bupụtara ndị ọrịa nʼokporoụzọ nibe ha nʼute na ihe ndina, ka ọ ga-abụ mgbe Pita na-agafe onyinyo ya ga-adakwasị ụfọdụ nʼime ha.Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa nʼụlọ Judas nke dị nʼokporoụzọ Guzoziri Eguzo, jụọ ajụjụ banyere onye a na-akpọ Sọl, onye si Tasọs, ọ nọ ugbu a na-ekpe ekpere.Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.Ndị Hibru1
Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ.Mkpughe3
Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe.Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile.Amaokwu niile gbasara isiokwu a
Hụkwa
- Ụzọ njemNyochaa · Ebraham, Ọpụpụ, Devid, njem Pọl — ebe nkwụsị na ebe nkwụsị na maapụ
- Maapụ na njem BaịbụlNyochaa · Njem, ụzọ ndị njem nsọ na maapụ ochie
Isi mmalite: Tyndale Open Bible Dictionary © 2023 Tyndale House Publishers, CC BY-SA 4.0 — e megharịrị ya ma mee ka o dị mkpụmkpụ; ọrụ mbụ dị nʼefu na tyndaleopenresources.com · Human-made Things in the Bible © United Bible Societies 2025, adapted from R. Pritz, The Works of Their Hands: Man-made Things in the Bible © 2009 UBS, CC BY-SA 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike