Ọba akwụkwọ ihe ọmụma › Ụlọ na ezinaụlọ
Ụlọ na ezinaụlọ
Mmiri maka ụlọ
Hibru bor (ihe icheta mmiri), be’er (olulu mmiri) · mmiri ozuzo oge oyi e chekwara maka oge ọkọchị
Nʼala ugwu ugwu nke Izrel, mmiri na-ezo naanị nʼoge oyi, ya mere ezinaụlọ ọbụla aghaghị ichekwa mmiri maka ogologo oge ọkọchị. Site nʼihe dị ka narị afọ nke 13 BC, ndị mmadụ ji plasta lime tee ihe icheta mmiri e gwuru nʼime nkume ka ọ jide mmiri, ụlọ pụkwara ịnakọta mmiri ozuzo oge oyi site nʼelu ụlọ na ogige ya. Ịṅụ “mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya” (2 Ndị Eze 18:31) pụtara ibi nʼudo nʼụlọ, Ilu na-ejikwa otu ihe atụ ahụ maka ikwesị ntụkwasị obi nʼalụmdi na nwunye (Ilu 5:15). Ihe icheta mmiri tọgbọrọ chakoo pụrụ ịbụ ụlọ mkpọrọ: e weturu Jeremaya nʼime otu nke “mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị” (Jeremaya 38:6).
Mmiri si nʼisi iyi maọbụ nʼolulu mmiri ka mma, ma a ga-ebu ya bịa. Iseta mmiri bụkarị ọrụ ụmụ nwanyị, nke a na-arụ nʼuhuruchi mgbe ọ dị jụụ, “oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri” (Jenesis 24:11), nʼite ụrọ; ya mere nwoke bu ite mmiri na Jerusalem bụ ihe ịrịba ama dị mfe ịhụ (Mak 14:13). Olulu mmiri bụkwa ebe nzute: nʼebe ahụ ka Ribeka zutere ohu Ebraham, Jekọb zutekwara Rechel (Jenesis 29). Nʼolulu mmiri Jekọb, Jisọs gwara otu nwanyị, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ” (Jọn 4:7).
Amaokwu ndị dị mkpa
“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ.Tupu o kpechaa ekpere a, lekwa Ribeka ada Betuel, nwa nwoke Milka, onye bụ nwunye Nahọ, nwanne Ebraham. Ọ na-apụta bukwasị ite nʼubu ya. Ọ bụ nwaagbọghọ mara mma nke ukwuu, onye na-amatabeghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-edinabeghị. Ọ gara nʼolulu mmiri kujuo ite ya si nʼebe ahụ na-arịgopụta.O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya.Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”Amaokwu niile kpọrọ ya aha (104)
Ebe okwu Hibru, Aramaic ma ọ bụ Grik maka ya dị n'ime ederede.
Jenesis26
Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu.Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi.Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.”O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ.Ngwangwa, ọ wụpụrụ mmiri dị nʼite ya nʼime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, gbara ọsọ gaa kute mmiri ọzọ na-agbanye nʼime ihe ahụ. O kugidere mmiri tutu ruo mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụjuchara afọ.Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ.O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ.Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta.Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya.Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna.O si nʼebe ahụ pụọ gaa nʼebe ọzọ gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma o nweghị ndị bịara zọọ ya. Nʼihi ya ọ kpọrọ olulu mmiri ahụ Rehobọt. O kwuru sị, “Ugbu a, Onyenwe anyị enyela anyị ebe sara mbara, ebe ihe ga-anọ gaara anyị nke ọma.”Ya mere, o wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. Ọ makwara ụlọ ikwu ya nʼebe ahụ. Ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri.Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohu Aịzik bịakwutere ya gwa ya banyere olulu mmiri ha na-egwu, sị ya, “Anyị achọtala mmiri nʼolulu ahụ anyị na-egwu.”NʼEbe Nsọ a, ọ hụrụ otu olulu mmiri, hụkwa ụzọ igwe atụrụ atọ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri nʼihi na ndị na-elekọta ha na-enye ha mmiri site nʼolulu mmiri ahụ. Nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ buru ibu.Nʼihi na mgbe igwe atụrụ niile bịazukọtara nʼolulu mmiri ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-emeghepụ nkume ahụ nye ha mmiri. Emesịa, ha na-ejikwa nkume ahụ mechie ọnụ olulu mmiri ahụ.Ha zara sị ya, “Anyị agaghị enye ha mmiri tutu ruo mgbe igwe atụrụ niile bịakọtara, mgbe e wepụrụ nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri, mgbe ahụ ka anyị ga-enye ha mmiri.”Mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne nne ya, hụkwa igwe atụrụ Leban, ọ meghepụrụ nkume ahụ e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ nye igwe atụrụ Leban, nwanne nne ya mmiri ka ha ṅụọ.Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya.Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya.Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya.Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.”Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero.Ọpụpụ4
Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri.Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.“Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya,onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ.Levitikọs1
Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.Ọnụọgụgụ5
Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.”Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a. “Sọpụta gị olulu mmiri! Bụọnụ abụ banyere mmiri a!Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.“Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”Diuteronomi1
na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ,Ndị Ikpe1
Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya.1 Samuel2
Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.”2 Samuel7
Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a.Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụNwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya.Mgbe ha lawara, mmadụ abụọ ahụ sitere nʼolulu mmiri ahụ rigopụta, gaa gwa eze Devid. Ha sịrị ya, “Bilie gafeenụ mmiri ngwangwa, nʼihi na Ahitofel adụọla Absalọm ọdụ otu a na otu a megide gị.”Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.2 Ndị Eze2
O nyere iwu sị, “Jidenụ ha na ndụ.” Ha jidere ha na ndụ, gbukwaa ha niile nʼakụkụ olulu miri nke Bet-Eked. Ọnụọgụgụ ha dị iri anọ na abụọ. O nweghị onye ọbụla ọ hapụrụ ndụ.“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:1 Ihe E Mere3
Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị,Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.2 Ihe E Mere1
O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.Nehemaya1
Ndị gị nwetara ala mara mma, na ọtụtụ obodo e wusiri ike; ha nwetakwara ọtụtụ ụlọ nke ihe ọma juru nʼime ha, na olulu mmiri e gwuru nke ọma, na ubi vaịnị mkpụrụ dị, na ubi oliv, na ọtụtụ osisi ọma ndị ọzọ na-amị mkpụrụ. Ha rijuru afọ, ahụ ha mara mma ile anya, ha ṅụrikwara ọṅụ nʼihi ngọzị ị gọziri ha.Abụ Ọma9
Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru.Abụ Ọma Devid. Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; gị bụ Oke nkume m, agbala m nkịtị. Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ.O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure; ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha. Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike.Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.Ilu4
Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.Ekiliziastis1
E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, tupu ite adawaa nʼisi iyi, tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.Abụ nke Abụ1
I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata.Aịzaya6
Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ, kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide, tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Onyenwe anyị! Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya. E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!Jeremaya12
“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ. Ha agbakụtala m azụ, bụ Isi iyi mmiri ndụ, gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla.Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta. Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya; ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge.Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya.Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin,“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.”Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ.Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche.Mgbe ha batara nʼobodo, Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom ahụ bụ ndị so ya, gburu ndị ahụ tụnye ozu ha nʼime olulu.Olulu ahụ Ishmel tụnyere ozu Gedaliya na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke Asa bụ eze gwuru maka ichebe Jerusalem mgbe Baasha eze Izrel na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka Ishmel, nwa Netanaya kpojuru nʼime olulu ahụ.Abụ Akwa2
Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.Izikiel9
mgbe ahụ ka m ga-eme ka ị rịdaruo nʼala mmụọ, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka i jekwuru ndị mgbe ochie. Aga m eme ka ebe obibi gị bụrụ nʼokpuru ime ime ala, ka ị dịrị ka obodo ndị ochie ahụ e tikpọrọ etikpọ. Gị na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ị gaghị esitekwa nʼebe ahụ lọghachi ịbịa isoro ndị dị ndụ birikwa.Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma.“Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu.Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha.“Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha.E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ.“Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu.“Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu.Zekaraya1
Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.Luk1
Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?”Jọn4
Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie.Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?”Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”Amaokwu niile gbasara isiokwu a
Hụkwa
Isi mmalite: Tyndale Open Bible Dictionary © 2023 Tyndale House Publishers, CC BY-SA 4.0 — e megharịrị ya ma mee ka o dị mkpụmkpụ; ọrụ mbụ dị nʼefu na tyndaleopenresources.com · Human-made Things in the Bible © United Bible Societies 2025, adapted from R. Pritz, The Works of Their Hands: Man-made Things in the Bible © 2009 UBS, CC BY-SA 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike