Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 18 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 5 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Novemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Galaction and his wife Epistimia, at Emesa (3rd C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
2Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele. 3Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ, 4ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri. 5Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma. 6Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma. 7Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m. 8Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume. 9Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a.
Oziọma
47“Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu. 48Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha. 49Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu. 50Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa, 51site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a. 52“Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.” 53Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu, 54na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya. 12:1Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Novemba na kalenda nzukọ bụ 18 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike