IGCB · Isi 1 / 3
Nehum 1
1Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.
2Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.
3Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.
4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
6Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.
7Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.
9Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.
10Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
11Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta, bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị, na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.
12Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.
13Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu, tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”
14Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”
15Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org