Bible Explorer

Baịbụl › Jeremaya › 45

IGCB · Isi 45 / 52

Jeremaya 45

1Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị,

2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk,

3Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’

4Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.

5Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje.’ ”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org